1 Chronicles 25

Ndị na-abụ abụ

1Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:

2Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf:
Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.
3Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya:
Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.
4Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya:
Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.
5Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.

6Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke.

Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.
7Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ (288). 8Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ.

9Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
10Nke atọ, Zakua na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
11Nke anọ, Izri na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
12Nke ise, Netanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
13Nza nke isii mara Bukaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
14Nke asaa, Jesarela na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
15Nke asatọ, Jeshaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
16Nke itoolu, Matanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
17Nke iri, Shimei na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
18Nke iri na otu, Azarel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
19Nza nke iri na abụọ mara Hashabaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
20Nke iri na atọ, Shubuel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
21Nke iri na anọ, Matitaia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
22Nke iri na ise, Jeremot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
23Nke iri na isii, Hananaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
24Nke iri na asaa, Joshbekasha na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
25Nza nke iri na asatọ mara Hanani, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
26Nke iri na itoolu, Maloti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
27Nke iri abụọ, Eliata na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
28Nke iri abụọ na otu, Hotia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
29Nke iri abụọ na abụọ, Gidalti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
30Nke iri abụọ na atọ, Mahaziot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
31Ebe nza nke iri abụọ na anọ mara Romamti-Eza, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
Copyright information for IboBIU